ISI NKE MBỤ
MKPỌLITE
Ntọala Nchọcha
Asụsụ bụ ihe mmadụ zuru oke na mmadụ nwere ike iji wee mebe
okwu maọbụ jiri ya dee ihe. O nweghị ihe e kere eke nwere ike
iji asụsụ mebe okwu maọbụ jiri ya dee ihe ma ọ bụghị mmadụ. Asụsụ bụ ihe jikọtara okwu, echiche maọbụ onyonyo dị mmadụ n’echiche
nke na-eme ka mmadụ nwee
ike ikwupụta
echiche ya maọbụ ikọwa ihe mmadụ kwuru.
Na mgbaso ụkwụ Mgbodile (1999) asụsụ n’usoro
mmụta
edukeshọn bụ ịghọta ihe asụsụ bụ na uru ọ bara na
mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Iji kwado ihe
o kwuru, ọ bụ eziokwu maka na e wezuga
asụsụ, o nweghị uru ọ bara mmadụ na mmad ụ ibe ya imekọta. Dịka Brooks si rụtụ aka n’akwụkwọ Azikiwe (1998), asụsụ bụ ihe a na-amụ n’usoro
kwesiri ekwesi dịka omenala
ndị siri dị n’ụdị ọ siri gbasata mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Naldman, 1971
gbasokwara ihe Brooks kwuru n’akwụkwọ Huxley na Ingram, 1989
mgbe ọ sịrị, asụsụ bụ mkpọkọba okwu n’usoro
echiche mmadụ siri dị nke ndị mmadụ ga-esi na ya gbado ụkwụ na mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
Asụsụ dịka Fendinand de Saussure
1995 na akwụkwọ Hartzeler 1965 bụ nkwekọrịta ndị mmadụ kwekọrịtara n’obodo,
nke ga-enye aka ịgbasa
usoro iwu mmekọrịta mmadụ na ibe ya ndị kwere n’otu
omenala.
Maka mkpa ọ dị n